EXSULTET IN IGBO (IKE NILE NKE ELIGWE) with lyrics

EXSULTET IN IGBO (IKE NILE NKE ELIGWE) with lyrics


#Exsultet #Exultet #IgboExultet #IgboExsultet

Here is my own rendition of the popular Igbo Exsultet by IZU MARCEL ONYEOCHA

=================================

Ike niile nke eligwe, nụriwanụ
Igwe ndị mmụọ ọma niile kwebenu ukwe, goribenu!
Ihe-okike niile nọrubere ukpoeze Chineke!
Jesu Kristi Eze anyị ebitego!
Gbubenu opi nke nzọpụta
Ụwa ṅụrịa n’ekike gị na-amụke amụke!
Were ihe nke onye Eze gị chawaputa!
Kristi emerigo!
Ebube e jupụtala n’ime gị!
Ọchịchịrị e nwekwaghi ọnọdụ n’ụwa

Nne di asọ bụ Ụka nụriwa!
Na-egori n’otito
Nya bụ onye nzọpụta nụ bilitere n’ọnwụ na-achakwasi gị!

Ka ebe a niile jupụta n’ụzụ aṅụrị
Na-azaghachi nnukwu abụ ndị nke Chineke nile!

(Ndị enyi m ọma mụ na ha guzo n’ihe a dị asọ, soronu m n’irio Chineke ebere, ka Ọ nye nwaodibọ Ya na-ekwesịghị ekwesị gratia iji kwee ukwu otito Pascha Ya)

C. Onyenweanyị nonyere ụnụ!

R. N’onyekwara mmụọ gị

C. Welitenu obi ụnụ elu!

R. Anyị ewelitela ha n’ebe Dinwenu no!

C. K’anyị Nyenụ Dinwenu Chukwu anyị ekele!

R. O kwesịrị, bụrụkwa ihe ziri ezi!

Ọ kwesịrị nnọọ
ka anyị were obi anyị niile,
mkpụrụ obi anyị niile
na olu anyị niile na-eto
Chineke na-anaghị ahụ anya,
Nna ji ike niile na sọ otu Nwa Ya,
Dinwenu anyi Jesu Kristi.
Maka na Kristi ejirila obara Ya gbata anyi,
kwụchitere anyị ụgwọ njọ Adam n’aka Nna di ụwatụwa.

Ihe a bụ emume ngafega anyị,
mgbe e ji egbu Kristi ezigbo Nwatụrụ
nke ọbara Ya na-edo ụlọ ndị niile kwerenu asọ

Ihe a bụ uchichi nụ
mgbe Ị zọpụtasịrị Nna anyị ha
I siri n’abụ m ohu tọhapụ ụmụ Izrel,
Duru ha ụkwụ kọrọ kọrọ ha kụfee osimiri
Ihe a bu uchichi nụ
mgbe ide ọkụ kposara ọchịchịrị nke njọ

Ihe a bụ anyasị nụ
mgbe a na-aghụchapụ njọ ndị otu Kristi nọ n’ebe niile,
Zọpụta ha na mmetọ niile
Kpọbata kwa ha. n’ọkwa gratia,
ọnọdụ ha a na-abawanye n’ adimasọ

Ibe a bụ uchichi nụ
mgbe Jesu Kristi dọbiri ụdọ igwe nke ọnwụ,
si n’ili bilite n’ebube!
Gịnị bụ uru ndụ gaara ibaara anyị,
ma asi na Kristi abịaghị bụrụ onye Nzọpụta anyị?

Nna, anya Ị na-eleta anyi adikakwanu egwu!
Ka nnukwu amara gi si karịa nchịkọta!
Nani maka iji gbapụta nwa ohu ka I jiri hanye Nwa Gị
O! mmehie ihu ọma!
O! njọ dị mkpa nụ Adam metara,
nke riteere anyi nnukwu onye Mgbapụta dị otu a!
Uchichi dị ngọzi karịchaa ibe ya!
Chineke họọrọ ya ịhụ ka Kristi si na ndi nwụrụ anwụ na ekite!
Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Uchichi a si:
“Uchichi ga-efo dị ka chi,
Ọ ga-abụ ihe m na aṅụrị m”
Ike nke uchichi a dị asọ
Na-achụsasị ajọ ihe niile,
Na-asachapụ ụta mmehie niile,
Na-eweghachite amaghi aghụghọ,
Na-ewetara ndị nọ n’uru obi aṅụrị.
Ọ na-ewepụ akpọmasi,
Na-ewetara anyi udo,
Na-emeda ngala nke ụwa a.
Ọ bụ uchichi a gọziri nnọọ n’ezie
Mgbe eligwe na ala jikọrọ aka gbaa akwụkwọ
A biakwa dozie agbata Chineke na mmadụ.
Ya bụ, Nna nke eligwe!
N’ime aṅụrị nke uchichi a,
Nabata aja otiti anyị na-ehunyere gị n’anyasi a.
Ọ bụ onyinye pụrụ iche nke ụka Gị.
Nara ọkụ Pasha nke a,
Ọ bụ ire ọkụ kewara ekewa mana ọ danyụghi adanyụ,
Ọ bụ ire ọkụ na-ebike na nsọpụrụ nke Chineke!
Ka ya na ọkụ nke eligwe gbagwaa na-enwu n’ike n’ike,
Ka ha kposaa ọchịchịrị nke uchichi a!
Ka kpakpando Ụtụtụ na-enweghị ọdịda
kwudo ire ọkụ a ka ọ na-enwu!

Kpakpando Ụtụtụ ahụ bụ Kristi
Onye siri na ndi nwụrụ anwụ pụta kwa ọzọ
Biakwa chakwasi ụwa niile ihe udo Ya!
Nwa Gị
Onye dị ndụ na-achị ebebe ebebe!

Amen!


Shop Now: Bible, songs & etc 


1. Follow us on our official WhatsApp channel for the latest songs and key updates!


2. Subscribe to Our Official YouTube Channel


Keywords: Tamil Christian song lyrics, Telugu Christian song lyrics, Hindi Christian song lyrics, Malayalam Christian song lyrics, Kannada Christian song lyrics, Tamil Worship song lyrics, Worship song lyrics, Christmas songs & more!


Disclaimer: "The lyrics are the property and copyright of their original owners. The lyrics provided here are for personal and educational purposes only."


We will be happy to hear your thoughts

      Leave a reply

      About Us

      WorldTamilChristians.com is part of the Christianmedias organization. We share Tamil Christian songs with lyrics and worship music in multiple languages. Our mission is to inspire prayer and devotion by connecting believers with powerful songs and the stories behind them.

      WorldTamilchristians - The Ultimate Collection of Christian Song Lyrics
      Logo